Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 10:8 - Bible Nso

8 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 10:8
12 Iomraidhean Croise  

Ma ekweghm okwu ahu, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera-ya: i tukwasiwo amam-ihe na idi-nma n'akukọ nke m'nuru.


Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon, bú nna-ya, mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?


Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu: Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.


Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.


Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya; Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu, N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi, Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.


Ma mu onwem, le, m'ganēbi na Mizpa, iguzo n'iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n'ihe-unu, biri-kwa-nu n'obodo nile unu nke unu wereworo.


Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.


Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ndikom nke ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ha ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomom; ma le, Onye ka Solomom nọ n'ebe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan