Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 10:26 - Bible Nso

26 Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, ọ we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 10:26
7 Iomraidhean Croise  

Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ulo uzọ ise nke inyinya diri ub͕ọ-ala-ya, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri.


Ma ub͕u a nye iwu ka ha b͕utuerem osisi cedar site na Lebanon; ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi; m'gēnye kwa gi ugwọ-ọlu ndi-orù-gi dika ihe nile si di nke i gāsim: n'ihi na gi onwe-gi amawo na ọ dighi nwoke n'etiti ayi mara ib͕utu osisi dika ndi Zaidon.


na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.


Solomon nwe-kwa-ra nnù ulo iri nke inyinya na ub͕ọ-ala, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n'obodo ub͕ọ-ala nile, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.


Ala-ha juputa-kwa-ra n'ọla-ọcha na ọla-edo, ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù-ha; ala-ha juputa-kwa-ra n'inyinya, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ub͕ọ-ala-ha.


Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n'Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n'ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n'uzọ ahu ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan