Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 1:39 - Bible Nso

39 Zedok, bú onye-nchu-àjà, we si n'Ulo-ikwū were mpi manu ahu, te Solomon. Ha we fùa opì-ike; ndì Israel nile we si, Ka eze, bú Solomon, di ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 Nʼebe ahụ, Zadọk onye nchụaja wepụtara mpi mmanụ ahụ dị nʼụlọ nzute Chineke, were tee Solomọn nʼisi. Ha fụkwara opi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze Solomọn dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 1:39
16 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu.


ka Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, te ya manu n'ebe ahu ibu eze Israel: fù-kwa-nu opì, si, Ka eze, bú Solomon, di ndu.


Ndi Israel nile we so ya n'azu rigo, ndi Israel nēb͕u kwa ọ̀jà, nāṅuri kwa oké ọṅù, ala we b͕awa n'olu-ha.


Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m'buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n'ihi na o sitere n'aka Jehova diri ya.


O we me ka nwa eze puta, o kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà; ha we me ya eze, te ya manu, kua aka-ha, si, Ka eze di ndu.


ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi, dika ikpé si di, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, kpọ, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.


Ma Elaisha, bú onye-amuma, kpọrọ otù onye nime umu ndi-amuma, si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were karama manu a n'aka-gi, je Remot-gilead.


Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n'okpuru ya n'elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze.


ha we were ọṅù uku rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Jehova ubọchi ahu. Ha we me Solomon nwa Devid eze nke ub͕ò abua, te ya manu nye Jehova ibu onye-ndú, ha te-kwa-ra Zedok manu ibu onye-nchu-aja.


Ha we me ka nwa eze puta, ha we kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà, me ya eze: Jehoiada na umu-ya ndikom we te ya manu; ha we si, Ka eze di ndu.


ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.


Achọtawom Devid, bú orùm; Ewerewom manu nsọm te ya:


i gēme ya ka ọ buru ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, nke etiyere nnú, nke anāgwaghi agwa, di kwa nsọ:


Samuel we si ndi Israel nile, Ùnu ahuwo onye ahu nke Jehova rọputaworo, na ọ dighi onye di ka ya n'etiti ndi Israel nile? Ndi Israel nile we tie nkpu, si, Ka eze-ayi di ndu.


Samuel we were mpi manu ahu, te ya n'etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n'ike site n'ubọchi ahu ga n'iru. Samuel we bilie, la Rema.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan