Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 1:36 - Bible Nso

36 Benaia nwa Jehoiada we za eze, si, Amen: ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem eze, si otú a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Benaya nwa Jehoiada zara eze sị, “Amen, ka Onyenwe anyị Chineke onyenwe m na eze, kwupụta ya ka ọ dị otu a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 1:36
16 Iomraidhean Croise  

Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'ije ozi.


Unu gēso kwa ya n'azu rigota, ọ gābia kwa nọkwasi n'oche-ezem; ya onwe-ya gābu kwa eze n'ọnọdum: ọ bu kwa ya ka m'nyeworo iwu ibu onye-ndú Israel na Juda.


Dika Jehova nọyeworo onye-nwem, bú eze, Ya nọyere Solomon otú a, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze onye-nwem, bú eze Devid.


ma ub͕u a I kwerewo igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n'iru Gi: n'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, agọziwo, o we buru ihe agọziri agọzi rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.


Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.


Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen.


Achọtawom Devid, bú orùm; Ewerewom manu nsọm te ya:


Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.


ka M'we me ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru nna-unu-hà, inye ha ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya, dika o si di ta. M'we za, si, Amen, Jehova.


o we si, bú Jeremaia onye-amuma, Amen: Jehova me otú a: Jehova me ka okwu-gi nile guzosie ike, bú nke i buworo amuma, ime ka ihe nile nke ulo Jehova, na ndi nile emere ka je biri n'ala ọzọ, si na Babilon lata n'ebe a.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Ma emeghi otú a, onye nọ n'ọnọdu onye nāmutaghi akwukwọ gēsi aṅa si Amen ahu mb͕e i nēkele ekele, ma ọ buru na i ji mọ-gi nāgọzi, ebe ọ nāmataghi ihe ọ bula i nēkwu?


Ọ bu kwa ezie na madu biliri ichu gi, na ichọ nkpuru-obi-gi: ma agēke nkpuru-obi onye-nwem na ngugu nke ndi di ndu n'aka Jehova, bú Chineke-gi; ma nkpuru-obi ndi-iro-gi, ha ka Ọ gēsi n'etiti oghere èbè-Ya mapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan