Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 1:31 - Bible Nso

31 Bat-sheba we rube isi kpuchie iru-ya n'ala, kpọ isi ala nye eze, si, Ka onye-nwem, bú eze Devid, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Mgbe ahụ, Batsheba kpọrọ isiala, gbukwaa ikpere nʼihu eze sị ya, “Ka onyenwe m eze Devid dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 1:31
14 Iomraidhean Croise  

Mefiboshet, nwa Jonatan, nwa Sọl, we biakute Devid, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala. Devid we si, Mefiboshet, Ọ si, Le orù-gi!


N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu.


M'we si eze, Ka eze di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: gini mere irum agaghi-eji jọ njọ, mb͕e obodo ahu, bú ulo nke ílì nnam-hà, bu nkpọnkpọ ebe, eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku?


Ndi-orù nile nke eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we nēruru ala, nākpọ kwa isi ala nye Heman: n'ihi na otú a ka eze nyere iwu bayere ya. Ma Mọdekai adighi-eruru ala, ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya.


Ndi Kaldea we si eze n'asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa.


Ha zara, si Nebukadneza, bú eze, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma eze-nwanyi were n'ihi okwu nile nke eze na ndi-isi-ya bata n'ulo oké oriri ahu: eze-nwanyi zara, si, Eze, di ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi; ka èchìchè-gi nile ghara ime ka i ma jijiji, ka ib͕u-maramara nke iru-gi ghara kwa ib͕anwe:


Mb͕e ahu Daniel gwara eze okwu, si, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.


Mb͕e ahu ndi-isi ndia na ndi nọchiri anya eze ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Daraiọs, bú eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma emesia o zigara ha ọkpara-ya, si, Ha gāsọpuru ọkparam.


Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.


Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?


Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá.


Devid we bilie ka emesiri, si n'ọb͕à ahu pua, kpọ òkù n'azu Sọl, si, Onye-nwem eze. Sọl we legide anya n'azu-ya, Devid we rube iru-ya n'ala, kpọ isi ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan