Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 1:21 - Bible Nso

21 Ma emeghi otú a, o gēru kwa, mb͕e onye-nwem, bú eze, soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na agāgu mu onwem na nwam, bú Solomon, na ndi-nmehie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ma ọ bụghị otu a, ngwangwa onyenwe m bụ eze ga-esoro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, mụ onwe m na nwa m Solomọn ka a ga-emeso mmeso dịka ndị mmebi iwu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 1:21
11 Iomraidhean Croise  

Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ.


Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.


Ma ub͕u a, biko, bia, ka m'dua gi ọdu, ka i we wepuga ndu-gi na ndu nwa-gi, bú Solomon.


Ma gi onwe-gi, onye-nwem, bú eze, anya Israel nile dikwasi gi, ka i we gosi ha onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri.


Ma, le, mb͕e ọ nọ nākpayere eze uka, Netan, bú onye-amuma, bata-kwa-ra.


Devid we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid.


Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m'buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n'ihi na o sitere n'aka Jehova diri ya.


Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile la n'iyì, bú ndi nwe ala-eze ulo Juda.


Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.


O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan