Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 1:17 - Bible Nso

17 Ọ si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi were Jehova, bú Chineke-gi, ṅuara orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 1:17
7 Iomraidhean Croise  

Sera we chì ọchì nime onwe-ya, si, M'gēnwe ihe-utọ mb͕e m'kasiri nká, onye-nwem bu kwa agadi?


Je bakwuru eze, bú Devid, si ya, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bughi gi onwe-gi ṅuru orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? ọ̀ bu kwa gini mere Adonaija ghọworo eze?


Le, mb͕e i nọ nākpayere eze uka n'ebe ahu, mu onwem gēso kwa gi n'azu bata, kwujue okwu-gi nile.


Bat-sheba we rube isi, kpọ isi ala nye eze. Eze we si, Gini ka i nāchọ?


Ma ub͕u a, le, Adonaija aghọwo eze; ma ub͕u a, onye-nwem, bú eze, i maghi ya:


n'ezie dika m'were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi n'oche-ezem n'ọnọdum; n'ezie otú a ka m'gēme ta.


dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n'ujọ ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan