Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 1:13 - Bible Nso

13 Je bakwuru eze, bú Devid, si ya, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bughi gi onwe-gi ṅuru orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? ọ̀ bu kwa gini mere Adonaija ghọworo eze?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Bakwuru eze Devid sị ya, ‘Onyenwe m bụ eze, ọ bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: “Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ ga-anọdụ nʼocheeze m”? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 1:13
16 Iomraidhean Croise  

Netan we gwa Bat-sheba, bú nne Solomon, okwu, si, Ì nughi na Adonaija nwa Hagit aghọwo eze, ma Devid, bú onye-nwe-ayi, amaghi?


Le, mb͕e i nọ nākpayere eze uka n'ebe ahu, mu onwem gēso kwa gi n'azu bata, kwujue okwu-gi nile.


Ọ si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi were Jehova, bú Chineke-gi, ṅuara orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem.


Netan we si, Onye-nwem, bú eze, Ọ̀ bu gi onwe-gi siri, Adonaija gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem?


n'ezie dika m'were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi n'oche-ezem n'ọnọdum; n'ezie otú a ka m'gēme ta.


Unu gēso kwa ya n'azu rigota, ọ gābia kwa nọkwasi n'oche-ezem; ya onwe-ya gābu kwa eze n'ọnọdum: ọ bu kwa ya ka m'nyeworo iwu ibu onye-ndú Israel na Juda.


Ọzọ kwa, otú a ka eze siri, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye nyeworom ta onye nānọkwasi n'oche-ezem, anyam nāhu kwa ya.


Solomon we nọkwasi n'oche-eze Devid nna-ya: ewe me ka ala-eze-ya guzosie ike nke-uku.


ma n'etiti umum ndikom nile, (n'ihi na ọtutu umu-ndikom ka Jehova nyerem,) O we rọputa Solomon nwam inọkwasi n'oche-eze nke ala-eze Jehova dika onye-isi Israel.


Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.


Ọ gēru kwa, mb͕e ọ nānọkwasi n'oche-eze nke ala-eze-ya, na ọ gēdeputara onwe-ya iwu a n'akwukwọ, site n'akwokwọ ahu nke di n'iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan