Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 5:9 - Bible Nso

9 Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n'ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 5:9
13 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.


Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam.


Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;


ebe O debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n'ezi omume nime ya site n'aka otù Nwoke Ọ kara àkà; O nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.


Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe ndia; Mọ Nsọ bu kwa onye-àmà, Onye Chineke nyere ndi nēkweyere Ya.


Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n'ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n'ọlu ike di iche iche, site kwa n'òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.


ka ayi we were ihe abua nādighi-agha, nke Chineke nāpughi ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi, bú ndi b͕abàra ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n'iru ayi;


Onye kwere n'Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n'ihi na o kweghi n'àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya.


N'ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan