Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.
N'ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n'ebe unu nọ; ya na otú unu siri n'arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu,
Umu-ntakirim, ihe ndia ka m'nēdegara unu n'akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume:
anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya.
Ma ndi fọduru n'etiti madu, ndi anēb͕ughi n'ihe-otiti ndia, echègharighi isi n'ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije: