Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 5:17 - Bible Nso

17 Ajọ omume nile bu nmehie: nmehie di kwa nke nādighi-eweta ọnwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 5:17
10 Iomraidhean Croise  

Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.


Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.


Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Mb͕e ahu agua ihe ọjọ ahu, mb͕e ọ tuworo ime, o we muputa nmehie: nmehie ahu, mb͕e o tozuru okè, o we muputa ọnwu.


Umu-ntakirim, ihe ndia ka m'nēdegara unu n'akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume:


Onye ọ bula nke nēme nmehie, ọ nēme kwa ihe nmebi iwu: nmehie bu kwa nmehie-iwu.


Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m'nāgwa ya ka o kpe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan