Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 4:17 - Bible Nso

17 Nime nka ka emeworo ka ihu-n'anya zue okè n'akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n'ubọchi ikpé ahu; n'ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n'uwa nka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 4:17
25 Iomraidhean Croise  

N'ezie asim unu, Ala Sọdọm na Gọmọra gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari obodo ahu.


O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?


Otú ọ di, asim unu, Taia na Saidon gānagide okwu n'ubọchi ikpé, kari unu.


Otú ọ di, asim unu, na ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari gi.


Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé.


Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu.


Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù;


N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna:


Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


I huwo na okwukwe-ya soro ọlu-ya lukọ ọlu, esite-kwa-ra n'ọlu ahu me ka okwukwe ahu zue okè;


Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;


ma elu-igwe nke di ub͕u a, ha na uwa, ka akpadoworo nye ọku site n'otù okwu ahu, ebe anēdebe ha nye ubọchi nke ikpé na ila-n'iyì nke ndi nādighi-asọpuru Chineke.


Umu-ntakirim, nānọgide-kwa-nu nime Ya ub͕u a; ka ọ gābu, ma ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu, ghara kwa iwere ihere pua n'iru Ya n'ọbibia-Ya.


ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n'ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya:


onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri.


Lenu aha ihunanya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke: ayi bu kwa umu-Ya. N'ihi nka uwa amaghi ayi, n'ihi na ọ maghi Ya.


Onye ọ bula nke nwere olile-anya nka n'ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ di ọcha, dika Ya onwe-ya di ọcha.


Umu-ntakirim, unu ekwela ka onye ọ bula duhie unu: onye nēme ezi omume bu onye ezi omume, dika Ya onwe-ya bu onye ezi omume:


Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula: ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n'anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n'anya-Ya zue okè nime ayi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan