Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 3:3 - Bible Nso

3 Onye ọ bula nke nwere olile-anya nka n'ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ di ọcha, dika Ya onwe-ya di ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 3:3
21 Iomraidhean Croise  

N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.


Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè.


Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere.


N'ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n'ezi-okwu.


ọ dighi kwa ókè Ọ kpara n'ab͕ata ayi na ha, ebe O mere ka obi-ha di ọcha site n'okwukwe.


Ọzọ kwa, Aisaia si, Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi, Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile; Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.


Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.


n'ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n'elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n'okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma,


Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n'anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,


ka, ebe ewere amara-Ya gua ayi na ndi ezi omume, ka ayi we ghọ ndi-nketa dika olile-anya nke ndu ebighi-ebi si di.


Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya:


ka ayi we were ihe abua nādighi-agha, nke Chineke nāpughi ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi, bú ndi b͕abàra ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n'iru ayi;


N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile;


Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua.


kama dika Onye kpọrọ unu di nsọ, unu onwe-unu, ghọ-kwa-nu ndi di nsọ n'ibi-obi nile di iche iche;


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,


bú nke O siteworo nye n'aka-ayi nkwa nile ahu di oké ọnu-ahia di kwa uku ri nne; ka unu we site n'ihe ndia ghọ ndi nēnwekọ ihe O ji buru Chineke, ebe unu b͕anariworo nmebi nke di n'uwa site n'agu ihe ọjọ.


N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, ebe unu nēle anya ihe ndia, nānunu ọku n'obi ka ewe hu unu n'udo, ndi nēnweghi ntupọ, ndi anāpughi kwa ita uta n'iru Ya.


onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri.


Nime nka ka emeworo ka ihu-n'anya zue okè n'akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n'ubọchi ikpé ahu; n'ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n'uwa nka.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan