Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 3:21 - Bible Nso

21 Ndi m'huru n'anya, ọ buru na obi-ayi amaghi ayi ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n'ebe Chineke nọ;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 3:21
17 Iomraidhean Croise  

N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ, I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.


Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka: Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.


M'gēnwe uche n'uzọ zuru okè: Òle mb͕e I gābiakutem? M'gējeghari n'etiti ulom n'izu-okè nke obim.


Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n'onwe-gi n'iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n'ihe ọ nānwaputa.


N'ihi na ọ dighi ihe ọ bula m'mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n'onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi.


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi.


Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n'ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka.


ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:


Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà.


Umu-ntakirim, nānọgide-kwa-nu nime Ya ub͕u a; ka ọ gābu, ma ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu, ghara kwa iwere ihere pua n'iru Ya n'ọbibia-Ya.


Ndi m'huru n'anya, ọ dighi ihe ọhuu enyere n'iwu nkem m'nēdegara unu, kama ihe ochie enyere n'iwu nke unu nwere site na mbu: ihe ochie ahu enyere n'iwu bu okwu ahu nke unu nuru.


Ndi m'huru n'anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n'ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.


n'ihe ọ bula nke obi-ayi nāma ayi ikpé nime ya; n'ihi na Chineke ka obi-ayi uku, Ọ ma-kwa-ra ihe nile.


Nime nka ka emeworo ka ihu-n'anya zue okè n'akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n'ubọchi ikpé ahu; n'ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n'uwa nka.


Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n'ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan