Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 3:10 - Bible Nso

10 Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu: onye ọ bula nke nādighi-eme ezi omume esighi na Chineke puta, onye nke nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya esighi kwa na Ya puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 3:10
26 Iomraidhean Croise  

Ma Absalom agwaghi Amnon okwu ọ bula ma ọ bu nke di njọ ma-ọbu nke di nma: n'ihi na Absalom kpọrọ Amnon asì. n'ihi na ọ wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.


ubi ahu bu uwa; nkpuru ọma ahu, ndi ahu bu umu ala-eze elu-igwe; ata ahu bu umu ajọ onye ahu;


Ma nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēme-kwa-nu ezi ihe nye ha, nēbinye kwa ihe, ghara iwepu itukwasi-obi; ugwọ-ọlu-unu gādi kwa uku, unu gābu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu: n'ihi na Ya onwe-ya nwere iru-ọma n'ebe ndi nēnweghi ekele na ndi bu ajọ madu nọ.


Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya:


ọ bughi kwa nání n'ọnọdu mba ahu, kama ka O we me kwa ka umu Chineke ndi b͕asaworo zukọ n'otù.


Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.


Onye sitere na Chineke nānu okwu Chineke: n'ihi nka ka unu onwe-unu nānughi ha, n'ihi na unu esiteghi na Chineke.


si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?


Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n'anya: n'ihi na onye nāhu madu-ibe-ya n'anya edebezuwo iwu.


Ya mere burunu ndi nēṅomi Chineke. dika umu ahuru n'anya;


ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè.


Ma ihe ezubere iweta n'iwu ahu bu ihu-n'anya sitere n'obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya:


Ọ buru na unu matara na Ọ bu onye ezi omume, unu mara na onye ọ bula nke nēme ezi omume bu kwa onye amuworo site na Ya.


Lenu aha ihunanya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke: ayi bu kwa umu-Ya. N'ihi nka uwa amaghi ayi, n'ihi na ọ maghi Ya.


Ndi m'huru n'anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n'ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.


Ihe a enyere n'iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n'ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n'anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n'anya.


Ayi onwe-ayi bu ndi siri na Chineke puta: onye mara Chineke nānu olu-ayi; onye nēsighi na Chineke puta adighi-anu olu-ayi. Ayi sitere na nka mara mọ ezi-okwu ahu, na mọ nduhie ahu.


Onye nādighi-ahu n'anya amaghi Chineke; n'ihi na Chineke bu ihu-n'anya.


Ayi matara na ayi bu ndi si na Chineke puta, uwa dum nātọb͕ọ kwa n'aka ajọ onye ahu.


Nime nka ka ayi mara na ayi nāhu umu Chineke n'anya, mb͕e ọ bula ayi nāhu Chineke n'anya, me kwa ihe nile O nyere n'iwu.


Onye m'huru n'anya, eṅomila ihe ọjọ, kama nēṅomi ezi ihe. Onye nēme ezi ihe bu onye siri na Chineke puta: onye nēme ihe ọjọ ahughi Chineke mb͕e ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan