Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 2:7 - Bible Nso

7 Ndi m'huru n'anya, ọ dighi ihe ọhuu enyere n'iwu nkem m'nēdegara unu, kama ihe ochie enyere n'iwu nke unu nwere site na mbu: ihe ochie ahu enyere n'iwu bu okwu ahu nke unu nuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 2:7
22 Iomraidhean Croise  

Abọla ọ́bọ̀, edebe-kwa-la iwe megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n'anya dika onwe-gi: Mu onwem bu Jehova.


Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Unu nuru na ekwuru, si, Hu madu-ibe-gi n'anya, kpọ kwa onye-iro-gi asì:


Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya.


Ha we jide ya, kuru ya je n'iru Areọpagọs, si, Àyi puru ima ihe ozizí ọhu nka bu, nke i nēkwu?


i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya.


Ma, ndi m'huru n'anya, emewo ka ayi kwere ihe ka nma bayere unu, bú ihe nke ha na nzọputa yikọ kwa, ọ bu ezie na ayi nēkwu otú a:


Ma unu onwe-unu, ka ihe ahu unu nuru site na mbu digide nime unu. Ọ buru na ihe ahu unu nuru site na mbu adigide nime unu, unu onwe-unu gānọgide kwa nime Ọkpara ahu, nọgide kwa nime Nna-Ya.


N'ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya:


Ndi m'huru n'anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n'ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.


Ndi m'huru n'anya, ọ buru na obi-ayi amaghi ayi ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n'ebe Chineke nọ;


Nka bu kwa ihe O nyere n'iwu, ka ayi kwere n'aha nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist, hurita kwa onwe-ayi n'anya, dika O nyere ayi iwu.


Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa.


Ndi m'huru n'anya, ọ buru na Chineke huru ayi n'anya otú a, ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n'anya.


Ihe a enyere n'iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n'ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n'anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n'anya.


Ndi m'huru n'anya, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: n'ihi na ihu-n'anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n'anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan