Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 2:4 - Bible Nso

4 Onye, nāsi, Amawom Ya, ma ọ dighi-edebe ihe nile O nyere n'iwu, ọ bu onye-ugha, ezi-okwu adighi kwa nime onye ahu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 2:4
13 Iomraidhean Croise  

Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.


N'ihi na ọtutu madu di ndi nēkweghi idi n'okpuru iwu, ndi nēkwu okwu efu, ndi nāghọb͕u kwa obi madu, ma nke kachasinu ndi si n'etiti ndi obibì-úgwù puta,


Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.


Ọ buru na ayi asi na ọ dighi mb͕e ọ bula ayi mehiere, ayi nēme Ya onye-ugha, okwu-Ya adighi kwa nime ayi.


Ọ buru na ayi asi na ayi nēso Ya nwekọ ihe, ma ayi nējeghari n'ọchichiri, ayi nēkwu okwu-ugha, ayi adighi-eme kwa ezi-okwu:


Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi.


nime nka ka ayi ma-kwa-ra na ayi amawo Ya, ma ọ buru na ayi edebe ihe nile O nyere n'iwu.


Onye nāsi na ya nọ n'ìhè ahu, ma ọ nākpọ nwa-nna-ya asì, ọ nānọ n'ọchichiri ahu rue ub͕u a.


Onye ọ bula nke nānọgide nime Ya adighi-emehie: onye ọ bula nke nēmehie ahughi Ya anya mb͕e ọ bula, ọ maghi kwa Ya.


Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n'anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n'ihi na onye nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya, bú onye ọ huworo, ọ pughi ihu Chineke n'anya, bú Onye ọ nāhughi mb͕e ọ bula.


Ndi m'huru n'anya, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: n'ihi na ihu-n'anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n'anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan