Ọzọ, ọtutu madu nime ndi nāraru ura n'ala, bú ájá, gēteta, ufọdu ibà na ndu ebighi-ebi, ufọdu ibà n'ita-uta riri nne na oyi agāsọ ha nke-uku mb͕e ebighi-ebi.
Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà.
N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.
N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi
otú ọ di, ọ bu n'ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m'buru ihe ilere anya n'etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi.
Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.