Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Jọn 2:18 - Bible Nso

18 Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Jọn 2:18
24 Iomraidhean Croise  

Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu.


N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.


N'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Kraist ahu; ha gēduhie kwa ọtutu madu.


Ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Ya; ha gēduhie kwa ọtutu madu.


Ya mere Jisus si ha, Umu-ntakiri, ùnu ji ihe-oriri ọ bula? Ha zara Ya, si, É-è.


Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.


Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.


Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;


Onye eburu uzọ mara n'ezie mb͕e akātọghi ntọ-ala nke uwa, ma emere ka Ọ puta ìhè n'ọgwugwu oge ndia n'ihi unu,


ndi ewere ike nke Chineke nēche nche site n'okwukwe rue nzọputa nke edoziworo ikpughe n'oge ikpe-azu.


Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:


Ma ndi-amuma ugha putakwara ìhè n'etiti ndi Israel, dika ndi-ozizí ugha gādi kwa n'etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n'iyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye b͕ara ha, ndi nēweta ila-n'iyì di ngwa tukwasi onwe-ha n'isi.


ebe unu buru uzọ mara nka, na ndi-ọchìe gēji ichì-ọchì bia na mb͕e ikpe-azu, nāga dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di,


Onye bu onye-ugha ahu ma-ọbughi onye nāgọ si na Jisus abughi Kraist ahu? Onye nāgọnari Nna-ayi na Ọkpara-Ya, onye a bu onye ahu nēmegide Kraist.


Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa.


ma mọ ọ bula nke nādighi-ekwuputa Jisus, o sighi na Chineke puta: nka bu kwa mọ nke onye ahu nēmegide Kraist, nke unu nuworo na ọ nābia; ọ bu kwa n'oge di ub͕u a ka ọ nọ n'uwa.


N'ihi na ọtutu ndi-nduhie apuwo ba nime uwa, bú ndi nādighi-ekwuputa na Jisus Kraist nābia n'anu-aru. Nka bu onye-nduhie ahu na onye ahu nēmegide Kraist.


na ha siri unu, N'oge ikpe-azu ndi-ọchì gādi, nāga dika agu ihe ọjọ nile nke aka ha nke asọpughi-Chineke si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan