1 Ihe E Mere 9:28 - Bible Nso28 Ufọdu nime ha bu kwa ndi-isi ihe òfùfè; n'ihi na n'ọnu-ọgugu ka ha nāchibata ha, n'ọnu-ọgugu kwa ka ha nāchipu ha. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a28 Ụfọdụ nʼime ha ka ọ dị nʼaka ilekọta ngwongwo e ji achụ aja. Ha na-agụ ya ọnụ mgbe ọbụla e webatara ya, na mgbe ọbụla a na-ewepụ ya. Faic an caibideil |
Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.