Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 9:2 - Bible Nso

2 Ma ndi-obibi mbu ndi bi n'ihe-onwunwe-ha n'obodo nile ha bu, Israel, ndi-nchu-aja, ndi Livai, na Netinim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼime ndị a, ndị bụ ụzọ lọta bịa birikwa nʼihe onwunwe ha nʼobodo nke aka ha bụ ụfọdụ ndị Izrel, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 9:2
11 Iomraidhean Croise  

Ma ndia bu umu ala ahu anāchi achi ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri na Babilon, ha we laghachi na Jerusalem na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya;


Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;


Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua.


Ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ufọdu nime ndi Juda, na ndi-ọbù-abù, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na Netinim, we biri n'obodo nile ha, Israel nile bi-kwa-ra n'obodo nile ha.


site kwa na Netinim, ndi Devid na ndi-isi nyere ka ha fè òfùfè nke ndi Livai, ọgu Netinim iri-na-otù: ha nile ka akpọrọ n'aha n'aha.


ha nēkekọta onwe-ha n'aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n'ọb͕ub͕a-iyi na n'ọṅuṅu-iyi, ijeghari n'iwu Chineke, nke enyere site n'aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;


Ndi-isi ndi-Ju we biri na Jerusalem: ndi-Ju fọduru fe-kwa-ra nzà, ime ka otù onye nime madu iri bata ibi na Jerusalem, bú obodo nsọ, ka uzọ iteghete ndi fọduru biri kwa n'obodo ọzọ.


Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua.


Ndi-nchu-aja, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na ufọdu nime ndi Juda, na Netinim, na Israel nile, we biri n'obodo nile ha. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan