Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 9:19 - Bible Nso

19 Ma Shalum nwa Kora, nwa Ebiasaf, nwa Kora, na umu-nne-ya, nke ulo nna-ya, bú ndi Kora, bu ndi-isi ije-ozi òfùfè ahu, ndi-nche nbata-uzọ nile nke ulo-ikwū: ndi bu nna-ha buri ndi-isi ọmuma-ulo-ikwū Jehova, ndi-nche uzọ-nbata;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 9:19
16 Iomraidhean Croise  

Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise iwu, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti akuku; ma onye nābiaso ya n'azu, werenu mma-agha me ka ọ nwua: n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Ka aghara ime ka ọ nwua n'ulo Jehova.


Ndi-isi usu ọgu ndikom ise we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha we biakute Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.


O rue, mb͕e ha huru na ego ahu riri nne n'ib͕e ahu, na ode-akwukwọ eze na onye-isi-nchu-àjà rigoro, ke ego ahu n'ihe, gu kwa ya, bú nke achọtara n'ulo Jehova.


ma ha nọ rue ub͕u a n'ọnu-uzọ-ama eze n'akuku ọwuwa-anyanwu: ndi ahu bu ndi-ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū umu Livai nwere.


Finehas nwa Eleeza bu kwa onye-ndú-ha na mb͕e gara aga, Jehova nọyere ya.


Dika agu iyi miri si agu nne-ele, Otú a ka agu Gi nāgu nkpuru-obim, Chineke.


Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi, Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie.


Nurunu nka, ndi nile di iche iche; Ṅanu nti, ndi nile bi n'uwa nka:


N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ. Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem, Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu.


m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:


Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan