Ma Jonatan nwa Sọl nwere nwa-nwoke nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. Ọ b͕ara arọ ise mb͕e akukọ Sọl na Jonatan siri na Jezreel bia, nwayi nāzù ya we kuru ya, b͕alaga: o rue, mb͕e ọ nēme ngwa ib͕alaga, na nwata ahu dara ada, we ghọ onye-ngwurọ. Aha-ya bu Mefiboshet.
I gālu-kwa-ra ya ọlu ala-ubi, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na ndi-orù-gi; i gēwebata kwa nkpuru ọ miri, ka nwa onye-nwe-gi we nwe nri ọ gēri: ma Mefiboshet nwa onye-nwe-gi gēri nri na table nkem mb͕e nile. Ma Ziba nwere umu-ndikom iri na ise na orú ndi-orù.