Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 8:33 - Bible Nso

33 Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Nea mụrụ Kish, nna Sọl. Ma Sọl mụrụ Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 8:33
10 Iomraidhean Croise  

Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim;


Devid we nye umu-okorọbia-ya iwu, ha we b͕ue ha, bipu aka-ha na ukwu-ha, kwuba ha n'akuku ọdọ-miri nime Hebron. Ma ha were isi Ish-boshet, lìe ya n'ílì Abnea nime Hebron.


Miklot we mua Shimea. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.


Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.


Emesia ha riọ ka enye ha eze: Chineke we nye ha Sọl nwa Kish, nwoke nke sitere n'ebo Benjamin, onye chiri eze ọgu arọ abua.


Ndi Filistia we sosie Sọl na umu-ya ndikom ike; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl.


Ma otù nwoke Benjamin di, aha-ya bu Kish, nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, nwa onye Benjamin, bú dike nke bu dìnkpà.


Ọ nwe-kwa-ra nwa-nwoke, aha-ya bu Sọl, ọ bu nwa-okorọbia, ọ ma-kwa-ra nma: ọ dighi kwa nwoke n'etiti umu Israel mara nma kari ya: site n'ubu-ya we rue elu isi-ya ka ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan