Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 7:29 - Bible Nso

29 na n'akuku umu Manase, Bet-shean na umu-obodo-ya, Teanak na umu-obodo-ya, na Megido na umu-obodo-ya, na Doa na umu-obodo-ya. Nime ndia ka umu Josef nwa Israel biri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 7:29
12 Iomraidhean Croise  

Beana nwa Ahailud, nime Teanak na Megido, na Bet-shean nile nke di n'akuku Zaretan, n'okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ofè Jọkmeam:


Ma nka bu ihe kpatara usu ndi nēfè òfùfè nke eze, bú Solomon, weputara; iwu ulo Jehova, na ulo nke aka ya, na Milo, na mb͕idi Jerusalem, na Hezoa, na Megido, na Gezea.


N'ubọchi-ya ka Fero-neko, bú eze Ijipt, rigoro imegide eze Asiria rue osimiri Yufretis: eze, bú Josaia, we je izute ya; o we me ka ọ nwua na Megido, mb͕e ọ huru ya.


Ma Ehazaia, bú eze Juda, huru ya, b͕alaga n'uzọ ulo ubi ab͕ara ogige. Jihu we chuso ya, si, Tib͕u-kwa-nu ya n'ub͕ọ-ala-ya. Ha we tib͕ue ya na nrigo Gua, nke di nso Ibleam. O we b͕alaga na Megido, nwua n'ebe ahu.


Ma Josaia esighi n'ebe ọ nọ chigharia iru-ya, kama o nwoghariri onwe-ya ibuso ya agha, ọ geghi kwa nti okwu Neko, bú nke sitere n'ọnu Chineke, o we bia ibu agha nime ndagwurugwu Megido.


N'ubọchi ahu oké otiti-aka-n'obi gādi na Jerusalem, dika otiti-aka-n'obi nke Hedad-rimon nime ndagwurugwu Megidon.


Ha we me ka ha zukọ n'ebe ahu nke anākpọ n'asusu Hibru Amagedọn.


Ndi-eze biara, bū agha; Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha, Nime Teanak n'akuku miri Megido: Ọ dighi urù ego ha nara.


Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo Ashtarot: ma ha kpọgidere ozu-ya na mb͕idi Bet-shan.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan