Nke ndi Hebron, Jerija bu onye-isi, ọbuná nke ndi Hebron, dika osuso-ọmumu nile ha si di n'ulo nke ndi bu nna. N'arọ nke-ọgu-abua Devid bu eze ka achọrọ ha, ewe chọta nime ha ndi-dike bu dìnkpà nime Jeza Gilead.
Ọzọ, I nyere ha ala-eze na ndi di iche iche, we kè ha n'òkè n'òkè n'akuku nile: ha we nweta ala Saihon, bú ala nke eze Heshbon, na ala Og, bú eze Beshan.
Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú; Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim; Imi-gi di ka ulo-elu Lebanon Nke chere Damaskọs iru.
Bilienu, bulie ije, gabiga ndagwurugwu Anon: le, enyewom Saihon onye-Amorait, bú eze Heshbon, na ala-ya, n'aka-gi: malite inweta ya, luso kwa ya ọ̀gù n'agha: