Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 6:60 - Bible Nso

60 site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

60 Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 6:60
12 Iomraidhean Croise  

Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya.


na Ashan na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile:


Enye-kwa-ra umu Kohat, bú ndi fọduru, nime ab͕uru ebo ahu, nime nkera ebo ahu, bú nkera ebo Manase, obodo iri n'ife-nzà.


Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat:


site kwa na Bet-gilgal, site kwa n'ọhia nile nke Geba na Azmavet: n'ihi na ndi-ọbù-abù wuru obodo ntà nye onwe-ha buruburu Jerusalem.


Were olu-gi tisie nkpu ike, ada Galim! ṅa nti, gi Laisha! Éwù, Anatot nke ewedara n'ala!


Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n'Anatot n'ala Benjamim:


ọ dighi kwa ndi fọduru ha gēnwe: n'ihi na M'gēme ka ihe ọjọ biakute ndi Anatot, n'arọ nleta-ha.


na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n'ebe ahu, n'etiti ndi Israel.


na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:


Jonatan we tib͕ue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia nke di na Geba, ndi Filistia we nu ya. Sọl we fùa opì-ike n'ala ahu nile, si, Ka ndi-Hibru nu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan