Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 6:32 - Bible Nso

32 Ha we nēje ozi n'iru ebe-obibi ulo-ikwū nzute n'abù, rue mb͕e Solomon wuru ulo Jehova nime Jerusalem: ha we guzo n'ibu ndi-isi òfùfè-ha dika ikpe ekpere ha si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ha jere ozi ịbụ abụ ha nʼihu ụlọ ikwu, ya bụ, ụlọ nzute, tutu ruo mgbe Solomọn wuchara ụlọnsọ Onyenwe anyị na Jerusalem. Ha jere ozi ha dịka usoro ije ozi ha si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 6:32
20 Iomraidhean Croise  

Johanan mua Azaraia, (ọ bu onye ahu bu onye-nchu-àjà n'ulo Solomon wuru nime Jerusalem:)


Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike.


Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel;


Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n'ime-ulo, ndi puru n'òfùfè ọzọ: n'ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n'ije-ozi ahu.


Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n'ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova.


Ndi-ọbù-abù, bú umu Esaf, nọ kwa n'ebe-nguzo-ha, dika ihe Devid, na Esaf, na Himan, na Jedutun, bú onye-ọhu-uzọ eze, nyere n'iwu si di; ndi-ọnu-uzọ-ama nọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nile ọ bula: ha enweghi ike isi n'òfùfè-ha wezuga onwe-ha, kama umu-nne-ha, bú ndi Livai, doziri ihe nye ha.


Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses.


Ọzọ, n'èzí ọnu-uzọ-ama di nime ka ime-ulo nke ndi-abù di n'ogige di nime, nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Ugwu; iru-ha di kwa n'uzọ Ndida: otù di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Iru-anyanwu nke iru-ya di n'uzọ Ugwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan