Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 6:3 - Bible Nso

3 Umu Amram kwa; Eron, na Moses, na Miriam. Umu-ndikom Eron kwa; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Amram mụrụ Erọn, Mosis na Miriam. Erọn mụrụ Nadab, Abihu, Elieza na Itama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 6:3
18 Iomraidhean Croise  

nke umu Uziel; Aminadab, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom ise na iri na abua.


Umu-ndikom Kohat; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel, anọ.


Umu-ndikom Amram; Eron na Moses: ewe kewapu Eron, ido ya nsọ ibu onye nsọ kachasi ndi nsọ nile, ya onwe-ya na umu-ya ndikom, rue mb͕e ebighi-ebi, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova, ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue mb͕e ebighi-ebi.


Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat.


Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.


Eleeza muru Finehas, Finehas muru Abishua;


Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.


Nwa-nne-ya nwayi we guzo onwe-ya n'ebe di anya, imara ihe gēme ya.


Nwa-nne-ya nwayi we si nwa-nwayi Fero, #M'gēje kpọrọ gi nwayi nēnye nwa ara site na ndinyom Hibru, ka ọ we nyere gi nwa nka ara?


Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n'ebe di anya:


Ma gi onwe-gi, me ka Eron, bú nwa-nne-gi, ya na umu-ya ndikom, si n'etiti umu Israel biakute gi nso, ka ọ we burum onye-nchu-aja, bú Eron, ya na Nedab na Abaihu, na Eleeza na Itama, bú umu-ndikom Eron.


Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa.


Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.


Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya, we weta nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n'iwu.


Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.


Moses we chọsie nkpi nke àjà-nmehie ike, ma, le, esurewo ya ọku: ọ we iwe n'aru Eleeza na n'aru Itama, bú umu-ndikom Eron fọduru, si,


N'ihi na M'mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa, ọ bu kwa n'ulo ndi-orù ka M'b͕aputara gi; M'we ziga Moses na Eron na Miriam iga n'iru gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan