Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 5:20 - Bible Nso

20 Ewe yere ha aka imegide ha, ewe nye ndi Haga na ndi nile ha na ha yikọrọ n'aka-ha: n'ihi na ọ bu Chineke ka ha kpọkuru n'agha ahu, O we kwe ka ha riọta ihe ha riọrọ; n'ihi na ha tukwasiri Ya obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 5:20
35 Iomraidhean Croise  

Aisak we riọ Jehova aririọ n'ihi nwunye-ya, n'ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime.


Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya: Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.


O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, N'ezie eze Israel ka ọ bu; ha we wezuga onwe-ha ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu.


Ha we chiri anu-ulo-ha n'agha: camel-ha orú nnù uzọ isi na nnù ise, na ìgwè ewu na aturu orú nnù orú uzọ na uzọ iri-na-otù na nnù ise, na inyinya-ibu nnù ise, na madu orú nnù uzọ iri-na-abua na nnù iri.


N'ihi na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u dara, n'ihi na agha ahu sitere na Chineke. Ha we biri n'ọnọdu ha rue mb͕e emere ka ha je biri n'ala ọzọ.


Ewe weda umu Israel n'ala na mb͕e ahu, umu Juda we b͕a ume, n'ihi na ha dabere na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.


O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n'ebe ọ nọ pua.


Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.


Chineke we yere ya aka imegide ndi Filistia, na imegide ndi Arebia ndi bi na Gua-beal, na Meunim.


O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke.


Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ.


Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia: Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.


Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu: Ọ nēme ka ha si n'aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha, N'ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.


Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.


Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi; N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.


O rue, mb͕e Moses weliri aka-ya elu, na Israel kariri ike: ma mb͕e o mere ka aka-ya zuru ike, Amalek kariri ike.


Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.


N'ihi na aghaghm ime ka i wepuga onwe-gi, ọ bughi kwa na mma-agha ka i gāda, kama ndu-gi gāghọrọ gi ihe-nkwata: n'ihi na i b͕abàwo nimem: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Mb͕e ahu ọ di eze nma n'anya nke-uku, o we si ka ha me ka Daniel rigoputa n'olùlù ahu. Ewe me ka Daniel si n'olùlù ahu rigota, ọ dighi kwa imeru-aru ọ bula ahuru n'aru-ya, n'ihi na ọ tukwasiri Chineke-ya obi.


Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n'ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya.


ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu:


Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha.


Eze ndia nile na ala-ha ka Joshua were n'otù mb͕e, n'ihi na Jehova, bú Chineke Israel, nēburu Israel agha.


Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù, dika Ọ gwara unu okwu.


Sọl we ziga ndi-ozi ahu ihu Devid, si, Bugotaram ya n'ihe-ndina-ya, ka m'we me ka ọ nwua.


Samuel we were otù nkume do ya n'etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan