O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o siri n'ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda;
Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we zigara ha ozi n'aka ndi-ozi-Ya, nēbili n'isi-ututu, nēzì kwa; n'ihi na O nwere ọmiko n'aru ndi-Ya na n'ebe ebe-obibi-Ya di:
Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ buru si na Konaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, bu nb͕a-aka-akàrà n'aka-nrim, ma ọbuná n'ebe ahu ka M'gādọpu gi;
Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n'ala nke ha nāmaghi?