Ndi-orù-ya we si na Megido buru ya nime ub͕ọ-ala mb͕e ọ nwuru anwu, ha we bubata ya na Jerusalem, lìe ya n'ílì-ya. Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, te ya manu, me ya eze n'ọnọdu nna-ya.
N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shalum nwa Josaia, bú eze Juda, nke bu eze n'ọnọdu Josaia, bú nna-ya, nke siri n'ebe a pua, si: Ọ gaghi-alata kwa n'ebe ahu ọzọ;