Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.
ha we rigo imegide Juda, we tipúe ya, dọta àkù nile ahuru n'ulo eze, na umu-ya ndikom kwa, na ndinyom-ya, n'agha; ọ dighi kwa nwa-nwoke fọduru ya, ọ bu nání Jehoahaz, bú nke-ntà nime umu-ya ndikom.
O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n'ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.