Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 3:11 - Bible Nso

11 Joram nwa-ya, Ehazaia nwa-ya, Joash nwa-ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 na Joram, na Ahazaya, na Joash,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 3:11
15 Iomraidhean Croise  

Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid nna-ya: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua.


Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.


Jehoash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze.


N'arọ nke-asa nke Jihu ka Jehoash malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.


Ma n'arọ nke-ise nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, mb͕e Jehoshafat bu kwa eze Juda, Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda, malitere ibu eze.


Joram we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.


N'arọ nke-iri-na-abua nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, ka Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, malitere ibu eze.


Nwa Solomon bu Rehoboam, Abaija nwa-ya, Esa nwa-ya, Jehoshafat nwa-ya;


Amazaia nwa-ya, Azaraia nwa-ya, Jotam nwa-ya;


Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.


ha we rigo imegide Juda, we tipúe ya, dọta àkù nile ahuru n'ulo eze, na umu-ya ndikom kwa, na ndinyom-ya, n'agha; ọ dighi kwa nwa-nwoke fọduru ya, ọ bu nání Jehoahaz, bú nke-ntà nime umu-ya ndikom.


O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n'ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.


Joash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan