10 Nwa Solomon bu Rehoboam, Abaija nwa-ya, Esa nwa-ya, Jehoshafat nwa-ya;
10 Ndị a bụ ụmụ Solomọn: Rehoboam, na Abija, na Asa, na Jehoshafat,
Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon. Abaijam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.
Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid, bú nna-ya: Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile nke ndu-ya.
Abaijam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
Joram nwa-ya, Ehazaia nwa-ya, Joash nwa-ya;
Ndia nile bu umu-ndikom Devid, nāgughi umu-ndikom ndi-iko-ya ndinyom; Tema bu nwa-nne-ha nwayi.
N'arọ nke iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam, ka Abaija malitere ibu eze Juda.
Abaija we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya: ala di jū n'ubọchi-ya arọ iri.
Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya, we me onwe-ya ka ọ di ike imegide Israel.