Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 28:21 - Bible Nso

21 Ma le, òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai di, ifè òfùfè nile nke ulo Chineke: onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo n'amam-ihe gādi kwa n'aka-gi n'ije-ozi ọ bula, ifè òfùfè ọ bula: ndi-isi na ndi Israel nile gēme kwa ka okwu-gi nile si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ndị nchụaja ndị a niile, na ndị Livayị jikeere ịrụ ọrụ niile metụtara ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. Ndị ọzọ bụ ndị ọka ọrụ dị iche iche ndị o metụrụ nʼobi ga-abịakwa inyere gị aka, ma ndị ozi, ma ndị Izrel niile; ha ga-emezu iwu ọbụla i nyere ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 28:21
12 Iomraidhean Croise  

Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,


Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.


Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi; N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu; Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.


baye-kwa-ra òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, baye-kwa-ra ije-ozi nile nke òfùfè ulo Jehova, baye-kwa-ra ihe nile nke òfùfè ulo Jehova:


Nwayi ọ bula nke nwere obi amam-ihe were kwa aka-ya tu ogho, ha we weta ogho nke ha turu, bú ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.


emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula,


Bezalel na Ọhọliab gālu kwa ọlu, ha na nwoke ọ bula nke nwere obi amam-ihe, ndi Jehova tiyeworo amam-ihe na nghọta nime ha ka ha mara ije ozi ọ bula nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, dika ihe nile si di nke Jehova nyere n'iwu.


Moses we kpọ Bezalel na Ọhọliab, na nwoke ọ bula nwere obi amam-ihe, onye Jehova tiyere amam-ihe n'obi-ya, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya ibiaru nso ozi ahu ije ya:


nime nke-iri-na-asatọ ọ mara Hanani, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:


Shelomot nka na umu-nne-ya bu ndi-isi ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile nke Devid, bú eze, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na usu ọgu ndikom ise, na ndi-isi usu-ndi-agha, doro nsọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan