Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 28:2 - Bible Nso

2 Devid, bú eze, we guzo ọtọ n'ukwu-ya abua, si, Nurunum, umu-nnem, na ndim: mu onwem, ọ di n'obim iwuru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova ulo izu-ike, nke gābu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu Chineke-ayi; m'we dozie ihe iji ewu ulo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Eze Devid biliri kwụrụ ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ụmụnna m, na ndị m. Ọ bụrịị ihe dị m nʼobi iwu ụlọ nke ga-abụ ebe izuike nye igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, nke ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ nye Chineke anyị. Edokọtachaala m ihe e ji ewu ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 28:2
30 Iomraidhean Croise  

Otù onye we gosi Jekob, si, Le, nwa-gi Josef nābiakute gi: Israel we jisie ike, nọdu n'elu ihe-ndina-ya.


Ọzọ kwa, ndi-orù eze biara igọzi onye-nwe-ayi, bú eze Devid, si, Chineke-gi me ka aha Solomon di nma kari aha-gi, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze-gi: eze we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya.


Gi onwe gi amawo Devid, bú nnam, na ọ pughi iwuru aha Jehova, bú Chineke-ya, ulo n'ihi agha nke b͕ara ya buruburu, rue mb͕e Jehova tiyere ha n'okpuru ọbu-ukwu-ya abua.


Je, si Devid, bú orùm, Otú a ka Jehova siri, Gi onwe-gi agaghi-ewurum ulo ibu ebe M'gēbi:


Ma, le, na nwedam edoziworom ulo Jehova ọla-edo orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri, na ọla-ọcha orú nnù talent ọgu uzọ isi na uzọ ise; ma ọla na ígwè enweghi ọtùtù; n'ihi na o riri nne: edoziwokwam osisi na nkume; i gātukwasi kwa ha ihe.


O we kpọ Solomon, bú nwa-ya, nye ya iwu iwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo.


Devid we si Solomon nwa-ya, Mu onwem, ọ di n'obim iwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo.


Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike.


O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo.


Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.


Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi: N'ebe a ka M'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya ike.


Otú ọ ṅuru Jehova iyi, Kwe Dike nke Jekob nkwa:


Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi: N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi.


Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di: Onye nsọ ka Ọ bu.


Ebube Lebanon gābiakute gi, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n'otù; ime ka ọnọdu ebe nsọm ma nma, M'gēme kwa ka ọnọdu ukwum abua nwe nsọpuru.


Otú a ka jehova siri, Elu-igwe bu oche-ezem, uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwum: àha ulo gini ka unu gēwurum? ma-ọbu àha ebe gini gābu ebe-izu-ikem?


Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n'iwe-Ya! O siwo n'elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n'ala, Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n'ubọchi iwe-Ya.


O we sim, Nwa nke madu, nka bu ebe nke oche-ezem, na ebe nke ọbu-ukwu nke ukwum abua, ebe M'gēbi n'etiti umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: ulo Israel agaghi-emeru kwa aha nsọm ọzọ, ha onwe-ha, ma-ọbu ndi-eze-ha, site n'ikwa-iko-ha, na site n'ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di elu ha;


Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.


Elu-igwe bu oche-ezem, Uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwum abua: Àha ulo gini ka unu gēwurum? ka Onye-nwe-ayi kwuru: Ma-ọbu gini bu ebe izu-ikem?


i ghaghi ido onye ahu, onye Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, ka ọ buru eze-gi: otù onye n'etiti umu-nne-gi ka i gēdo eze-gi: i pughi ido nwoke ala ọzọ eze-gi, nke nābughi nwa-nne-gi.


ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n'ihe enyere n'iwu wezuga onwe-ya, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n'ala-eze-ya, ya onwe-ya na umu-ya, n'etiti Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan