Onye-isi ulo-àkù nile nke eze bu Azmavet nwa Adiel: onye-isi ulo-àkù nile nke di n'ọhia, na n'obodo nile, na n'obodo ntà nile, na n'ulo-elu nile, bu kwa Jehonatan nwa Uzaia:
O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n'ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n'ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n'ebe di ala ala, ma n'ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n'ugwu na nime Kamel; n'ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n'anya.