Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.
Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.
Nke ndi Hebron, Hashabaia na umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, nnù ndikom anọ na ọgu ise, bu ndi-isi nlekọta Israel n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu; bayere ozi nile nke Jehova, baye-kwa-ra òfùfè eze.