Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 25:6 - Bible Nso

6 Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke. Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 25:6
17 Iomraidhean Croise  

Devid na ulo Israel nile nēgwu egwū n'iru Jehova, were ihe nile eji osisi fir me, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na castanet, na ájà.


Eze we were osisi almug ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ihe-ndabere, ọ were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: osisi almug di otú a abiaghi, ahughi kwa ha, rue ta.


Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù.


Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha;


Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n'ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n'ibū ibu ahu, n'ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu.


nnù ndikom iri bu ndi-ọnu-uzọ; nnù ndikom iri nēto Jehova n'ihe m'mere iji to Ya, ka Devid kwuru.


Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova.


ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.


na Shimri na Jeuel, ndi sitere n'umu Elizafan: na Zekaraia na Matanaia, ndi sitere n'umu Esaf:


O we guzo ndi Livai n'ulo Jehova, ndi chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, dika ihe ahu si di nke Devid, na Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke eze, na Netan, bú onye-amuma, nyere n'iwu: n'ihi na o sitere n'aka Jehova, bú ihe ahu enyere n'iwu, site n'aka ndi-amuma-Ya.


na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.


Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.


N'ihi na n'ubọchi Devid na Esaf site na mb͕e ochie onye-isi nke ndi-ọbù-abù di, na abù otuto na ikele-ekele nke anābùku Chineke.


Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu, N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.


nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;


Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan