21 Nke Rehabia: nke umu Rehabia, onye-isi bu Ishia.
21 Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
Umu-ndikom Elieza bu kwa Rehabia, bú onye-isi. Ma Elieza enweghi umu-ndikom ọzọ; ma umu-ndikom Rehabia bara uba nke-uku.
Ma nke umu Livai ndi fọduru: nke umu Amram, Shubael; nke umu Shubael, Jehdeia.
Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat.
Umu-nne-ya kwa; bú umu nke Elieza: Rehabaia nwa-ya, na Jeshaia nwa-ya, na Joram nwa-ya, na Zikri nwa-ya, na Shelomot nwa-ya.
Umu-ndikom Uzi kwa; Izrahia: umu-ndikom Izrahia kwa; Maikael, na Obadaia, na Joel, na Ishia, ise: ndi-isi ka ha nile bu.