Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 24:2 - Bible Nso

2 Nedab na Abaihu we nwua n'iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 24:2
11 Iomraidhean Croise  

Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n'ebe di anya:


Moses we rigo, ya na Eron na Nedab na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye nke Israel:


I gēwere kwa ihe ike n'úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n'isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n'ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom.


Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.


Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova.


Ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēdebe ọlu-nchu-àjà-unu bayere ihe nile nke ebe-ichu-àjàm, baye-kwa-ra ihe di nime ákwà-nb͕ochi; unu gēfè kwa: dika òfùfè nke onyinye ka M'nēnye unu ọlu-nchu-àjà-unu: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.


Nedab na Abaihu we nwua mb͕e ha wetara nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ.


Ndia bu kwa aha umu-ndikom Eron;ọkpara-ya, bú Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.


Nedab na Abaihu we nwua n'iru Jehova, mb͕e ha wetara nso ọku ala ọzọ n'iru Jehova n'ọzara Sainai, ha enweghi kwa nwa; Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà n'iru Eron, bú nna-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan