8 Umu-ndikom Ladan; onye-isi bu Jehiel, na Zitam, na Joel, atọ.
8 Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ: Jehiel, onyeisi ha, Zetam na Juel.
Devid we kpọ Zedok, kpọ kwa Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, kpọ kwa ndi Livai, bú Uriel, na Asaia, na Joel, na Shemaia, na Eliel, na Aminadab,
nke umu Giashom; Joel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi na iri:
Nke ndi Giashon; Ladan na Shimai.
Umu-ndikom Shimai; Shel-omot, na Haziel, na Haran, atọ. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Ladan.
Umu-ndikom Ladan; umu ndi Giashon, bú ndi Ladan nwere, ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Ladan onye Giashon nwere; Jehieli.
Ndi achọtara nkume di oké ọnu-ahia n'aka-ha we nye ha itiye n'ulo-àkù nke ulo Jehova, n'aka Jehiel onye Giashon.
Ladan nwa-ya, Amaihud nwa-ya, Elishama nwa-ya;