Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 23:5 - Bible Nso

5 nnù ndikom iri bu ndi-ọnu-uzọ; nnù ndikom iri nēto Jehova n'ihe m'mere iji to Ya, ka Devid kwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito Onyenwe anyị, na-eto ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 23:5
23 Iomraidhean Croise  

Eze we were osisi almug ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ihe-ndabere, ọ were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: osisi almug di otú a abiaghi, ahughi kwa ha, rue ta.


Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.


na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama:


O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:


na iguzo kwa-ututu ikele na ito Jehova, otú a kwa n'anyasi;


Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n'ime-ulo, ndi puru n'òfùfè ọzọ: n'ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n'ije-ozi ahu.


Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova.


Ha bu kwa ndi-isi nke ndi-ibu, ha nēdu kwa ndi nile nēje ozi ifè òfùfè ọ bula: ufọdu nime ndi Livai bu kwa ndi-ode-akwukwọ, na ndi-odozi-okwu, na ndi-ọnu-ama.


Ndi-ọbù-abù, bú umu Esaf, nọ kwa n'ebe-nguzo-ha, dika ihe Devid, na Esaf, na Himan, na Jedutun, bú onye-ọhu-uzọ eze, nyere n'iwu si di; ndi-ọnu-uzọ-ama nọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nile ọ bula: ha enweghi ike isi n'òfùfè-ha wezuga onwe-ha, kama umu-nne-ha, bú ndi Livai, doziri ihe nye ha.


Dika ikpé Devid, bú nna-ya, si di, o we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà bayere òfùfè-ha, na ndi Livai bayere ihe-ndebe nile ha, ito Chineke, na ije ozi n'iru ndi-nchu-àjà, ime ihe ubọchi n'ubọchi-ya: o guzo-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama n'òkè nile ha n'ọnu-uzọ-ama ọ bula: n'ihi na otú a ka ihe si di nke Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu.


Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.


Ndi-nchu-aja, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na ufọdu nime ndi Juda, na Netinim, na Israel nile, we biri n'obodo nile ha. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha.


Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi, Isi-iyim nile di na Gi.


Obodo nsọ Gi nile aghọwo ọzara, Zaion aghọwo ọzara, Jerusalem aghọwo ebe tọb͕ọrọ n'efu.


ndi nābùso olu une abù efu; dika Devid ka ha zuputaworo onwe-ha ubọ-abù di iche iche;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan