1 Ihe E Mere 23:24 - Bible Nso24 Ndia bu umu Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-ha agukọtara, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndi nēje ozi ahu diri òfùfè ulo Jehova, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a24 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo. Faic an caibideil |
Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova.