Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 23:13 - Bible Nso

13 Umu-ndikom Amram; Eron na Moses: ewe kewapu Eron, ido ya nsọ ibu onye nsọ kachasi ndi nsọ nile, ya onwe-ya na umu-ya ndikom, rue mb͕e ebighi-ebi, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova, ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ụmụ ndị ikom Amram bụ, Erọn na Mosis. Erọn ka e kewapụrụ iche, ido ya nsọ ya na ụmụ ya ruo ebighị ebi, maka ido ihe niile kachasị nsọ nsọ, ịchụ aja nʼihu Onyenwe anyị, ije ozi nʼihu ya nakwa ikwupụta ngọzị nʼaha ya ruo ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 23:13
38 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Kohat; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel, anọ.


Umu Amram kwa; Eron, na Moses, na Miriam. Umu-ndikom Eron kwa; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.


nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa;


Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.


Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya, Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya; Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.


I gēme kwa ihe di mbara nke ọla-edo anāgwaghi agwa, i gēb͕u kwa n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.


M'gēdo kwa ulo-ikwū nzute nsọ, ya na ebe-ichu-àjà ahu: Eron na umu-ya ndikom ka M'gēdo kwa nsọ, iburum ndi-nchu-àjà.


Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa.


ka unu we kpa kwa ókè n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, na n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha;


Jehova we si Eron, Gi onwe-gi na umu-gi ndikom na ulo nna-gi tiyere gi gēbu ajọ omume nke ebe nsọm: gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēbu kwa ajọ omume nke ọlu-nchu-àjà-unu.


Aha nwunye Amram bu Jokebed, nwa Livai, nke amuru ya nye Livai n'Ijipt: nwayi ahu we muara Amram Eron na Moses, na Miriam, bú nwa-nne-ha nwayi.


Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat.


dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n'ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n'ife nzà.


Ma mb͕e ha nēfè Onye-nwe-ayi òfùfè, nēbu kwa ọnu, Mọ Nsọ siri, Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M'kpọworo ha ka ha lua.


Pọl, orù nke Jisus Kraist, onye akpọrọ ibu onye-ozi, onye ekewapuru nye ozi ọma Chineke,


Ma mb͕e ọ di Chineke ezi nma, bú Onye sitere n'oge m'nọ n'afọ nnem kewaputam, site kwa n'amara-Ya kpọm,


Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta.


ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi:


Ọ dighi kwa onye ọ bula nānara nsọpuru a n'onwe-ya, kama mb͕e Chineke nākpọ ya, ọbuná dika Ọ kpọ-kwa-ra Eron.


Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n'elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n'ekpere ndi nsọ nile nke di n'elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n'iru oche-eze ahu.


Èsim n'ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n'irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan