Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 22:6 - Bible Nso

6 O we kpọ Solomon, bú nwa-ya, nye ya iwu iwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel ụlọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 22:6
15 Iomraidhean Croise  

Fero we nye ndikom ufọdu iwu bayere ya: ha we zilaga ya na nwunye-ya na ihe nile nke ọ nwere.


O rue, mb͕e eze biri n'ulo-ya, mb͕e Jehova me-kwa-ra ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu,


Ma ubọchi Devid biaruru nso ka ọ nwua; o we nye Solomon, bú nwa-ya, iwu, si,


O rue, mb͕e Devid biri n'ulo-ya, na Devid siri Netan, bú onye-amuma, Le, mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nēbi n'okpuru ákwà-nkwuba.


Devid, bú eze, we guzo ọtọ n'ukwu-ya abua, si, Nurunum, umu-nnem, na ndim: mu onwem, ọ di n'obim iwuru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova ulo izu-ike, nke gābu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu Chineke-ayi; m'we dozie ihe iji ewu ulo.


o we bikwasi ya aka-ya abua, nye kwa ya iwu, dika Jehova kwuru n'aka Moses.


rue ubọchi anara Ya n'elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu:


Jehova we si Moses, Le, ubọchi-i gānwu nābiaru nso: kpọ Joshua, guzo-kwa-nu onwe-unu n'ulo-ikwū nzute, ka M'we nye ya iwu. Moses na Joshua we je, guzo onwe-ha n'ulo-ikwū nzute.


O we nye Joshua nwa Nun iwu, si, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka umu Israel ba n'ala ahu nke M'ṅuru ha iyi inye ha: Mu onwem gānọye-kwa-ra gi.


Anamagwasi gi ike n'iru Chineke, na n'iru Kraist Jisus, na n'iru ndi-mọ-ozi arọputara, ka i debe iwu ndia, ghara ima ikpé mb͕e i kānughi, ghara kwa ime ihe ọ bula n'uzọ isọ-anya.


Anamagwasi gi ike n'iru Chineke na Kraist Jisus, Onye gaje ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé, ewerekwam ngosi-Ya na ala-eze-Ya si gi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan