Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 22:10 - Bible Nso

10 onye ahu gēwuru aham ulo; ya onwe-ya gāburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna; M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike n'elu Israel rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 22:10
16 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m'buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n'ihi na o sitere n'aka Jehova diri ya.


Ma ub͕u a Jehova nādi ndu, Onye meworo ka m'guzosie ike, O me kwa ka m'nọkwasi n'oche-eze Devid, bú nnam, Jehova Onye mewo-kwa-ram ulo, dika O kwuru, n'ezie agēme ka Adonaija nwua ta.


Ma, le, m'nāsi na m'gēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, dika Jehova gwara Devid, bú nnam, okwu, si, Nwa-gi, onye M'gētiyekwasi n'oche-eze-gi n'ọnọdu gi, ya onwe-ya gēwuru aham ulo.


Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya mezue ya, si,


M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi n'isi Israel guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi; dika M'gwara Devid, bú nna-gi, okwu si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'inọkwasi n'oche-eze Israel.


ma n'etiti umum ndikom nile, (n'ihi na ọtutu umu-ndikom ka Jehova nyerem,) O we rọputa Solomon nwam inọkwasi n'oche-eze nke ala-eze Jehova dika onye-isi Israel.


I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta.


Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta? ọzọ kwa, Mu onwem gāburu Ya Nna, Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan