Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 21:7 - Bible Nso

7 Ọ we jọ njọ n'anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Iwu banyere ọnụọgụgụ a adịghịkwa Chineke mma nʼanya. Ya mere, ọ tara ndị Izrel ahụhụ nʼihi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 21:7
14 Iomraidhean Croise  

Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n'ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n'anya Jehova.


ma ọ buru na Ọ si otú a, Ihe-gi atọghm utọ; lem, Ya mem otú ọ di nma n'anya-Ya.


Oké unwu we di n'ubọchi Devid arọ atọ n'usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n'ihi Sọl na n'ihi ulo ọbara ya, n'ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua.


Ha we lìe ọkpukpu Sọl na Jonatan nwa-ya n'ala Benjamin nime Zela, n'ílì Kish, bú nna-ya: ha we me ihe nile eze nyere n'iwu. Ewe riọta Chineke aririọ bayere ala ahu mb͕e ihe a gasiri.


Iwe Jehova we di kwa ọku ọzọ megide Israel, O we kpalie Devid imegide ha, si, Je guta Israel na Juda.


Obi Devid we ta ya uta mb͕e ọ gusiri ndi Israel. Devid we si Jehova, Emehiewom nke-uku n'ihe m'meworo: ma ub͕u a, Jehova, biko me ka ajọ omume-orú-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.


n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het.


Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we dapu n'Israel.


Ma ọ gukọtaghi Livai na Benjamin n'etiti ha: n'ihi na okwu eze bu ihe-árú n'anya Joab.


Devid we si Chineke, Emehiewom nke-uku n'ihe a m'meworo: ma ub͕u a, biko, me ka ajọ omume orù-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.


Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova; n'ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel.


Bilie, do ndim nsọ, si, Donu onwe-unu nsọ bayere echi: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ihe ewezugara nyem di n'etiti gi, Israel: i pughi iguzosi ike n'iru ndi-iro-gi, rue mb͕e unu gēwezuga n'etiti onwe-unu ihe ahu ewezugara nyem.


Ndikom Ai we tib͕ue ihe ra ka orú madu na iri na isi sitere na ha: ha we si n'iru ọnu-uzọ-ama chugide ha rue Shebarim, we tib͕ue ha na nrida ahu: obi we lọ ndi Israel miri, we ghọ miri miri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan