Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 21:3 - Bible Nso

3 Joab we si, Ka Jehova tukwasiri ndi-Ya, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise: onye-nwem, bú eze, hà abughi ndi-orù onye-nwem nwere, ha nile? n'ìhi gini ka onye-nwem nāchọ ihe a? n'ìhi gini ka ọ gāghọrọ Israel ihe-ikpe-ọmuma?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ma Joab zaghachiri, “Ka Onyenwe anyị mee ka ndị agha ya mụbaa, otu onye narị ụzọ karịa. Ma onyenwe m eze, ọ bụ na ndị a niile abụghị ndị nọ nʼokpuru ọchịchị onyenwe m? Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achọ ime ihe a? Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji wetara Izrel ikpe ọmụma?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 21:3
15 Iomraidhean Croise  

Abimelek we kpọ Abraham, si ya, Gini bu ihe i meworo ayi? gini bu kwa ihe m'mehie-woro megide gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasim, biakwasi kwa ala-ezem? omume nke nēkwesighi ime ka imeworo m.


Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.


Eze, bú Jehoash, we kpọ Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa ndi-nchu-àjà ọzọ, si ha, Gini mere unu emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike? ma ub͕u a unu anarala ego n'aka ndi unu mara, kama nyenu ya ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.


Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.


Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ. Joab we pua, jegharia n'Israel nile, biarue Jerusalem.


Ka Jehova tukwasiri unu madu, Ka Ọ tukwasiri unu, tukwasi-kwa-ra umu-unu.


Mb͕e i nāguta ọnu-ọgugu umu Israel, dika ndi anāgukọta agukọta n'etiti ha si di, ha nile n'otù n'otù gēnye kwa Jehova ihe-nb͕aputa bayere nkpuru-obi-ha, mb͕e i nāgukọta ha; ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti ha mb͕e i nāgukọta ha.


Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha?


N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di: Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di.


I tukwasiwo madu na mba nka, Jehova, I tukwasiwo madu na mba nka; I natawo nsọpuru: I mewo ka nsọtu nile nke ala di anya.


nkpuru-gi gādiwo-kwa-ri ka ájá, umu nke si n'afọ-gi puta di ka umu-ihe si n'afọ oké osimiri ahu puta: agaghi-ebipuwori aha-ya ma-ọbu kpochapu ya n'irum.


Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, tukwasi unu madu kari ka unu ra nnù uzọ abua na ọgu uzọ iri, gọzi kwa unu, dika Ọ gwara unu!


Ha we biakute umu Reuben, biakute kwa umu Gad, biakute kwa nkera ebo Manase, rue ala Gilead, ha we gwa ha okwu, si,


É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan