Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 21:24 - Bible Nso

24 Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n'ego zuru ezu o ruru: n'ihi na m'gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m'gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya Onyenwe anyị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 21:24
9 Iomraidhean Croise  

na m'gaghi-ewere ihe ma-ọli nime ihe ọ bula nke i nwere, site n'ogho we rue eriri-akpukpọ-ukwu, ka i we ghara isi, Mu onwem emewo Abram ka ọ buru ọgaranya.


Ọ gwa Efron okwu na nti ndi ala ahu, si, Kama, ọ buru na gi onwe-gi kwere, biko, nuru olum: enyewom ego ọhia ahu; naram ya, ka m'we lìe onye-nkem nwuru anwu n'ebe ahu.


ka ọ we nyem ọb͕à Makpila, nke ọ nwere, nke di n'isi nke ọhia-ya n'ego zuru ezu o ruru ka ọ gēnyem ya n'etiti unu ka ọ buru ihe-onwunwe, nke gābu ala-ílì.


Eze we si Arọna, É-è; kama aghaghm izuru ya n'aka-gi n'ọnu-ahia: m'gaghi-esure-kwa-ra Jehova, bú Chinekem, àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula. Devid we were ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri zuru ebe-nzọcha-ọka ahu na ehi ahu.


Ọnan we si Devid, Were ya n'onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n'anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m'nyeworo.


Devid we nye Ọnan nnù shekel ọla-edo na ọgu iri n'ọtùtù iji zuru ebe ahu.


Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan